The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joshua 21
Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
Joshua 21:7 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Joshua 21Next →
The children of Merari by their families had out of the tribe of Reuben, and out of the tribe of Gad, and out of the tribe of Zebulun, twelve cities.
And the descendants of Merari received twelve cities from the tribes of Reuben, Gad, and Zebulun.
The children of Merari according to their families had twelve cities out of the tribe of Reuben, out of the tribe of Gad, and out of the tribe of Zebulun.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.
5 Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase.
6 Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.
7 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.
9 Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha
10 kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.
Read Joshua 21 in the app The whole chapter