The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joshua 21
Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
Joshua 21:1 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Joshua 21Next →
Then came near the heads of the fathers of the Levites unto Eleazar the priest, and unto Joshua the son of Nun, and unto the heads of the fathers of the tribes of the children of Israel;
Now the family heads of the Levites approached Eleazar the priest, Joshua son of Nun, and the heads of the other tribes of Israel
Then the heads of fathers’ houses of the Levites came near to Eleazar the priest, and to Joshua the son of Nun, and to the heads of fathers’ houses of the tribes of the children of Israel.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
2 na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”
3 Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.
Read Joshua 21 in the app The whole chapter