The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 9
Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
John 9:26 · Baịbụlụ Nsọ
Then said they to him again, What did he to thee? how opened he thine eyes?
“What did He do to you?” they asked. “How did He open your eyes?”
They said to him again, “What did he do to you? How did he open your eyes?”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
23 Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
24 Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”
25 Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
26 Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
27 Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
28 Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
29 Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
Read John 9 in the app The whole chapter