The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 8
Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
John 8:16 · Baịbụlụ Nsọ
And yet if I judge, my judgment is true: for I am not alone, but I and the Father that sent me.
But even if I do judge, My judgment is true, because I am not alone; I am with the Father who sent Me.
Even if I do judge, my judgment is true, for I am not alone, but I am with the Father who sent me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”
14 Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.
15 Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.
16 Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
17 E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’
18 Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”
19 Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”
Read John 8 in the app The whole chapter