The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 3
Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
John 3:7 · Baịbụlụ Nsọ
Marvel not that I said unto thee, Ye must be born again.
Do not be amazed that I said, ‘You must be born again.’
Don’t marvel that I said to you, ‘You must be born anew.’
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”
5 Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
6 Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ.
7 Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
8 Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”
9 Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?”
10 Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a?
Read John 3 in the app The whole chapter