The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 3

John 3:30

Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.

John 3:30 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead John 3Next →

John 3:30 in other translations

KJV King James Version

He must increase, but I must decrease.

BSB Berean Standard Bible

He must increase; I must decrease.

WEB World English Bible

He must increase, but I must decrease.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

27 Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.

28 Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.

29 Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.

30 Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.

31 “Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.

32 Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.

33 Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.

Read John 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV