The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 13
Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.
John 13:15 · Baịbụlụ Nsọ
For I have given you an example, that ye should do as I have done to you.
I have set you an example so that you should do as I have done for you.
For I have given you an example, that you should also do as I have done to you.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
12 Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu?
13 Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ.
14 Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu.
15 Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.
16 Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi.
17 Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.
18 “Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’
Read John 13 in the app The whole chapter