The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joel

Joel 3

Baịbụlụ Nsọ

1 “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,

2 na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.

3 Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.

4 “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.

5 Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.

Read Joel 3 in the app

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV