The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joel 2

Joel 2:17

Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”

Joel 2:17 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Joel 2Next →

Joel 2:17 in other translations

KJV King James Version

Let the priests, the ministers of the LORD, weep between the porch and the altar, and let them say, Spare thy people, O LORD, and give not thine heritage to reproach, that the heathen should rule over them: wherefore should they say among the people, Where is their God?

BSB Berean Standard Bible

Let the priests who minister before the LORD weep between the portico and the altar, saying, “Spare Your people, O LORD, and do not make Your heritage a reproach, an object of scorn among the nations. Why should they say among the peoples, ‘Where is their God?’”

WEB World English Bible

Let the priests, the ministers of the LORD, weep between the porch and the altar, and let them say, “Spare your people, LORD, and don’t give your heritage to reproach, that the nations should rule over them. Why should they say among the peoples, ‘Where is their God?’”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

14 Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.

15 Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.

16 Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.

17 Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”

18 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.

19 Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.

20 “Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.

Read Joel 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV