The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joel 1
O nwere mba bịakwasịrị ala m, usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ; nke nwere eze dịka ọdụm, nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
Joel 1:6 · Baịbụlụ Nsọ
For a nation is come up upon my land, strong, and without number, whose teeth are the teeth of a lion, and he hath the cheek teeth of a great lion.
For a nation has invaded My land, powerful and without number; its teeth are the teeth of a lion, and its fangs are the fangs of a lioness.
For a nation has come up on my land, strong, and without number. His teeth are the teeth of a lion, and he has the fangs of a lioness.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 Gwanụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha, ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
4 Ihe igurube rifọrọ ka igurube ukwu richara, ihe igurube ukwu rifọrọ, ka ụmụ igurube richara, ihe ụmụ igurube rifọrọ ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.
5 Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa. Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya; kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ, nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
6 O nwere mba bịakwasịrị ala m, usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ; nke nwere eze dịka ọdụm, nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
7 Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam. O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m, kpofuo ha, hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.
8 Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
9 Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya nʼụlọ Onyenwe anyị. Ndị nchụaja na-eru ụjụ, bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
Read Joel 1 in the app The whole chapter