The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joel 1
Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.
Joel 1:13 · Baịbụlụ Nsọ
Gird yourselves, and lament, ye priests: howl, ye ministers of the altar: come, lie all night in sackcloth, ye ministers of my God: for the meat offering and the drink offering is withholden from the house of your God.
Put on sackcloth and lament, O priests; wail, O ministers of the altar. Come, spend the night in sackcloth, O ministers of my God, because the grain and drink offerings are withheld from the house of your God.
Put on sackcloth and mourn, you priests! Wail, you ministers of the altar. Come, lie all night in sackcloth, you ministers of my God, for the meal offering and the drink offering are withheld from your God’s house.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
11 Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
12 Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.
13 Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.
14 Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.
15 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
16 Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?
Read Joel 1 in the app The whole chapter