The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Job 32
Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
Job 32:13 · Baịbụlụ Nsọ
Lest ye should say, We have found out wisdom: God thrusteth him down, not man.
So do not claim, ‘We have found wisdom; let God, not man, refute him.’
Beware lest you say, ‘We have found wisdom. God may refute him, not man;’
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
11 Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
12 Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
14 Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.
15 “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha.
16 M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
Read Job 32 in the app The whole chapter