The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Job 22
“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
Job 22:21 · Baịbụlụ Nsọ
Acquaint now thyself with him, and be at peace: thereby good shall come unto thee.
Reconcile now and be at peace with Him; thereby good will come to you.
“Acquaint yourself with him now, and be at peace. By it, good will come to you.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
19 Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
20 ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
21 “Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
22 Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
23 Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
24 tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
Read Job 22 in the app The whole chapter