The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Jeremiah 38
Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ:
Jeremiah 38:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Jeremiah 38Next →
But if thou refuse to go forth, this is the word that the LORD hath shewed me:
But if you refuse to surrender, this is the word that the LORD has shown me:
But if you refuse to go out, this is the word that the LORD has shown me:
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”
19 Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”
20 “Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị.
21 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ:
22 A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’
23 “A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.”
24 Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ.
Read Jeremiah 38 in the app The whole chapter