The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Jeremiah 3

Jeremiah 3:21

A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.

Jeremiah 3:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Jeremiah 3Next →

Jeremiah 3:21 in other translations

KJV King James Version

A voice was heard upon the high places, weeping and supplications of the children of Israel: for they have perverted their way, and they have forgotten the LORD their God.

BSB Berean Standard Bible

A voice is heard on the barren heights, the children of Israel weeping and begging for mercy, because they have perverted their ways and forgotten the LORD their God.

WEB World English Bible

A voice is heard on the bare heights, the weeping and the petitions of the children of Israel; because they have perverted their way, they have forgotten the LORD their God.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”

19 “Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.

20 Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

21 A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.

22 “Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.

23 Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.

24 Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.

Read Jeremiah 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV