The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Jeremiah 21

Jeremiah 21:11

“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.

Jeremiah 21:11 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Jeremiah 21Next →

Jeremiah 21:11 in other translations

KJV King James Version

And touching the house of the king of Judah, say, Hear ye the word of the LORD;

BSB Berean Standard Bible

Moreover, tell the house of the king of Judah to hear the word of the LORD.

WEB World English Bible

“Concerning the house of the king of Judah, hear the LORD’s word:

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

8 “Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ.

9 Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.

10 Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’

11 “Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.

12 Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.

13 Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem, gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a, onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha? Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”

14 Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile, nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ ”

Read Jeremiah 21 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV