The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Jeremiah 13

Jeremiah 13:21

Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?

Jeremiah 13:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Jeremiah 13Next →

Jeremiah 13:21 in other translations

KJV King James Version

What wilt thou say when he shall punish thee? for thou hast taught them to be captains, and as chief over thee: shall not sorrows take thee, as a woman in travail?

BSB Berean Standard Bible

What will you say when He sets over you close allies whom you yourself trained? Will not pangs of anguish grip you, as they do a woman in labor?

WEB World English Bible

What will you say when he sets over you as head those whom you have yourself taught to be friends to you? Won’t sorrows take hold of you, as of a woman in travail?

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”

19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.

20 Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?

21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?

22 Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.

23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.

24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.

Read Jeremiah 13 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV