The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 7

Isaiah 7:23

Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.

Isaiah 7:23 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 7Next →

Isaiah 7:23 in other translations

KJV King James Version

And it shall come to pass in that day, that every place shall be, where there were a thousand vines at a thousand silverlings, it shall even be for briers and thorns.

BSB Berean Standard Bible

And on that day, in every place that had a thousand vines worth a thousand shekels of silver, only briers and thorns will be found.

WEB World English Bible

It will happen in that day that every place where there were a thousand vines worth a thousand silver shekels, will be for briers and thorns.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

20 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile.

21 Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ.

22 Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.

23 Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.

24 Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.

25 Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.

Read Isaiah 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV