The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 7

Isaiah 7:16

Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.

Isaiah 7:16 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 7Next →

Isaiah 7:16 in other translations

KJV King James Version

For before the child shall know to refuse the evil, and choose the good, the land that thou abhorrest shall be forsaken of both her kings.

BSB Berean Standard Bible

For before the boy knows enough to reject evil and choose good, the land of the two kings you dread will be laid waste.

WEB World English Bible

For before the child knows to refuse the evil and choose the good, the land whose two kings you abhor shall be forsaken.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

13 Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?

14 Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.

15 Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.

16 Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.

17 Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”

18 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa.

19 Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile.

Read Isaiah 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV