The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 66
Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
Isaiah 66:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 66Next →
As one whom his mother comforteth, so will I comfort you; and ye shall be comforted in Jerusalem.
As a mother comforts her son, so will I comfort you, and you will be consoled over Jerusalem.”
As one whom his mother comforts, so I will comfort you. You will be comforted in Jerusalem.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.
11 Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
12 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya.
13 Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
14 Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
15 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
Read Isaiah 66 in the app The whole chapter