The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 65
Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
Isaiah 65:7 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 65Next →
Your iniquities, and the iniquities of your fathers together, saith the LORD, which have burned incense upon the mountains, and blasphemed me upon the hills: therefore will I measure their former work into their bosom.
both for your iniquities and for those of your fathers,” says the LORD. “Because they burned incense on the mountains and scorned Me on the hills, I will measure into their laps full payment for their former deeds.”
your own iniquities and the iniquities of your fathers together”, says the LORD, “who have burned incense on the mountains, and blasphemed me on the hills. Therefore I will first measure their work into their bosom.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 ndị na-anọdụ nʼetiti ili, ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche; ndị na-eri anụ ezi, ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;
5 ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso, nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’ Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m. Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.
6 “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha.
7 Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.
9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.
10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike.
Read Isaiah 65 in the app The whole chapter