The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 63
Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
Isaiah 63:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 63Next →
And I looked, and there was none to help; and I wondered that there was none to uphold: therefore mine own arm brought salvation unto me; and my fury, it upheld me.
I looked, but there was no one to help; I was appalled that no one assisted. So My arm brought Me salvation, and My own wrath upheld Me.
I looked, and there was no one to help; and I wondered that there was no one to uphold. Therefore my own arm brought salvation to me. My own wrath upheld me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara, dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị?
3 “Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile.
4 Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola.
5 Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.
6 Nʼiwe m, azọpịara mba niile dị iche iche; esitere m nʼọnụma juru m obi zọpịasịa ha. Emekwara ka ọbara ndụ ha bụrụ ihe a wụsiri nʼala.”
7 Aga m ekwupụta ihe banyere ịhụnanya Onyenwe anyị. Aga m eto ya nʼihi ihe niile o mere. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị mma ya nʼebe Izrel nọ, e, nʼihi ọtụtụ ihe ọma o mere nʼihi mmeso ọma niile o mesoro ụlọ Izrel, nke ọ na-emeso ha dịka obi ebere ya na ọmịiko ya si dị.
8 Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.
Read Isaiah 63 in the app The whole chapter