The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 62

Isaiah 62:2

Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.

Isaiah 62:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 62Next →

Isaiah 62:2 in other translations

KJV King James Version

And the Gentiles shall see thy righteousness, and all kings thy glory: and thou shalt be called by a new name, which the mouth of the LORD shall name.

BSB Berean Standard Bible

Nations will see your righteousness, and all kings your glory. You will be called by a new name that the mouth of the LORD will bestow.

WEB World English Bible

The nations will see your righteousness, and all kings your glory. You will be called by a new name, which the LORD’s mouth will name.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu.

2 Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.

3 Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.

4 A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye.

5 Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.

Read Isaiah 62 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV