The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 59
Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
Isaiah 59:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 59Next →
None calleth for justice, nor any pleadeth for truth: they trust in vanity, and speak lies; they conceive mischief, and bring forth iniquity.
No one calls for justice; no one pleads his case honestly. They rely on empty pleas; they tell lies; they conceive mischief and give birth to iniquity.
No one sues in righteousness, and no one pleads in truth. They trust in vanity and speak lies. They conceive mischief and give birth to iniquity.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.
2 Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.
3 Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
4 Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
5 Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
6 Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
7 Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
Read Isaiah 59 in the app The whole chapter