The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 56
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
Isaiah 56:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 56Next →
For thus saith the LORD unto the eunuchs that keep my sabbaths, and choose the things that please me, and take hold of my covenant;
For this is what the LORD says: “To the eunuchs who keep My Sabbaths, who choose what pleases Me and hold fast to My covenant—
For the LORD says, “To the eunuchs who keep my Sabbaths, choose the things that please me, and hold fast to my covenant,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị, “Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ihe ziri ezi. Nʼihi na nzọpụta m dị nso, ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.
2 Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a, bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike, onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya, nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”
3 Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
4 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
5 Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
6 Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
7 ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”
Read Isaiah 56 in the app The whole chapter