The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 49

Isaiah 49:20

Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka, ga-asịkwa na ntị gị, ‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị, nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’

Isaiah 49:20 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 49Next →

Isaiah 49:20 in other translations

KJV King James Version

The children which thou shalt have, after thou hast lost the other, shall say again in thine ears, The place is too strait for me: give place to me that I may dwell.

BSB Berean Standard Bible

Yet the children of your bereavement will say in your hearing, ‘This place is too small for us; make room for us to live here.’

WEB World English Bible

The children of your bereavement will say in your ears, ‘This place is too small for me. Give me a place to live in.’

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

17 Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.

18 Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.

19 “Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu, ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe, ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị, otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya.

20 Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka, ga-asịkwa na ntị gị, ‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị, nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’

21 Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị, ‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile? A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara. Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ. Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m. Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a? Onye zụlitere ha?’ ”

22 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ, weliere ha ọkọlọtọ m, ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha. Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.

23 Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị, ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara. Ha ga-akpọ isiala nye gị, rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”

Read Isaiah 49 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV