The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 44
Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’ maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
Isaiah 44:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 44Next →
One shall say, I am the LORD'S; and another shall call himself by the name of Jacob; and another shall subscribe with his hand unto the LORD, and surname himself by the name of Israel.
One will say, ‘I belong to the LORD,’ another will call himself by the name of Jacob, and still another will write on his hand, ‘The LORD’s,’ and will take the name of Israel.”
One will say, ‘I am the LORD’s.’ Another will be called by the name of Jacob; and another will write with his hand ‘to the LORD,’ and honor the name of Israel.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
3 Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
4 Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri, e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
5 Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’ maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
6 “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.
7 Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya. Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ! Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike. Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro, ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
8 Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”
Read Isaiah 44 in the app The whole chapter