The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 37
Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,
Isaiah 37:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 37Next →
Then Isaiah the son of Amoz sent unto Hezekiah, saying, Thus saith the LORD God of Israel, Whereas thou hast prayed to me against Sennacherib king of Assyria:
Then Isaiah son of Amoz sent a message to Hezekiah: “This is what the LORD, the God of Israel, says: Because you have prayed to Me concerning Sennacherib king of Assyria,
Then Isaiah the son of Amoz sent to Hezekiah, saying, “The LORD, the God of Israel says, ‘Because you have prayed to me against Sennacherib king of Assyria,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu,
19 ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
20 Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”
21 Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,
22 nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.
23 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?
24 I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
Read Isaiah 37 in the app The whole chapter