The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 34

Isaiah 34:2

Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.

Isaiah 34:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 34Next →

Isaiah 34:2 in other translations

KJV King James Version

For the indignation of the LORD is upon all nations, and his fury upon all their armies: he hath utterly destroyed them, he hath delivered them to the slaughter.

BSB Berean Standard Bible

The LORD is angry with all the nations and furious with all their armies. He will devote them to destruction; He will give them over to slaughter.

WEB World English Bible

For the LORD is enraged against all the nations, and angry with all their armies. He has utterly destroyed them. He has given them over for slaughter.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị. Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa. Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya, na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.

2 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.

3 Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.

4 Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.

5 Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.

Read Isaiah 34 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV