The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 33
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
Isaiah 33:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 33Next →
But there the glorious LORD will be unto us a place of broad rivers and streams; wherein shall go no galley with oars, neither shall gallant ship pass thereby.
But there the Majestic One, our LORD, will be for us a place of rivers and wide canals, where no galley with oars will row, and no majestic vessel will pass.
But there the LORD will be with us in majesty, a place of wide rivers and streams, in which no galley with oars will go, neither will any gallant ship pass by there.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
19 Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.
20 Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
21 Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
22 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
23 A tọsaala ụdọ niile: Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike, a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe. Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.
24 Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,” nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.
Read Isaiah 33 in the app The whole chapter