The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 33
Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
Isaiah 33:16 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 33Next →
He shall dwell on high: his place of defence shall be the munitions of rocks: bread shall be given him; his waters shall be sure.
he will dwell on the heights; the mountain fortress will be his refuge; his food will be provided and his water assured.
he will dwell on high. His place of defense will be the fortress of rocks. His bread will be supplied. His waters will be sure.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!
14 Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”
15 Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.
16 Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
17 Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
18 Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
19 Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.
Read Isaiah 33 in the app The whole chapter