The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 32
Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị.
Isaiah 32:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 32Next →
Upon the land of my people shall come up thorns and briers; yea, upon all the houses of joy in the joyous city:
and for the land of my people, overgrown with thorns and briers— even for every house of merriment in this city of revelry.
Thorns and briers will come up on my people’s land; yes, on all the houses of joy in the joyous city.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị, unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji; nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi, owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa.
11 Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
12 Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.
13 Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị.
14 Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha.
15 Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.
16 A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara, ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ.
Read Isaiah 32 in the app The whole chapter