The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 29
Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
Isaiah 29:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 29Next →
Yet I will distress Ariel, and there shall be heaviness and sorrow: and it shall be unto me as Ariel.
And I will constrain Ariel, and there will be mourning and lamentation; she will be like an altar hearth before Me.
then I will distress Ariel, and there will be mourning and lamentation. She shall be to me as an altar hearth.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel, gị obodo ebe Devid bi. Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.
2 Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
3 Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
4 Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.
5 Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,
Read Isaiah 29 in the app The whole chapter