The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 28

Isaiah 28:7

Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.

Isaiah 28:7 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 28Next →

Isaiah 28:7 in other translations

KJV King James Version

But they also have erred through wine, and through strong drink are out of the way; the priest and the prophet have erred through strong drink, they are swallowed up of wine, they are out of the way through strong drink; they err in vision, they stumble in judgment.

BSB Berean Standard Bible

These also stagger from wine and stumble from strong drink: Priests and prophets reel from strong drink and are befuddled by wine. They stumble because of strong drink, muddled in their visions and stumbling in their judgments.

WEB World English Bible

They also reel with wine, and stagger with strong drink. The priest and the prophet reel with strong drink. They are swallowed up by wine. They stagger with strong drink. They err in vision. They stumble in judgment.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

4 Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya, nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe, ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo, nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka, tinye nʼọnụ ya, loo ha.

5 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya, ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ okpueze mara mma, ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.

6 Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi nye ndị ikpe. Ọ ga-abụkwa ike nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama.

7 Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.

8 Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi. O nwekwaghị ebe dị ọcha.

9 “Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe? Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya? Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara, bụ ndị a ka napụrụ ara?

10 Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya, ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ, nʼusoro tụkwasị nʼusoro, nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.”

Read Isaiah 28 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV