The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 13
A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
Isaiah 13:22 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 13Next →
And the wild beasts of the islands shall cry in their desolate houses, and dragons in their pleasant palaces: and her time is near to come, and her days shall not be prolonged.
Hyenas will howl in her fortresses and jackals in her luxurious palaces. Babylon’s time is at hand, and her days will not be prolonged.
Hyenas will cry in their fortresses, and jackals in the pleasant palaces. Her time is near to come, and her days will not be prolonged.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile, ịma mma na ebube ndị Kaldịa, mgbe Chineke ga-akwatu ya ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya. Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara. Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa, na ikwighịkwighị, nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
Read Isaiah 13 in the app The whole chapter