The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 13
Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
Isaiah 13:1 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 13Next →
The burden of Babylon, which Isaiah the son of Amoz did see.
This is the burden against Babylon that Isaiah son of Amoz received:
The burden of Babylon, which Isaiah the son of Amoz saw.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
2 Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
3 Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.
4 Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
Read Isaiah 13 in the app The whole chapter