The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 10
Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.
Isaiah 10:32 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 10Next →
As yet shall he remain at Nob that day: he shall shake his hand against the mount of the daughter of Zion, the hill of Jerusalem.
Yet today they will halt at Nob, shaking a fist at the mount of Daughter Zion, at the hill of Jerusalem.
This very day he will halt at Nob. He shakes his hand at the mountain of the daughter of Zion, the hill of Jerusalem.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
29 Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
30 Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!
31 Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.
32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.
33 Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.
34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.
Read Isaiah 10 in the app The whole chapter