The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Hosea 9
Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
Hosea 9:13 · Baịbụlụ Nsọ
Ephraim, as I saw Tyrus, is planted in a pleasant place: but Ephraim shall bring forth his children to the murderer.
I have seen Ephraim, like Tyre, planted in a meadow. But Ephraim will bring out his children for slaughter.
I have seen Ephraim, like Tyre, planted in a pleasant place; but Ephraim will bring out his children to the murderer.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 “Mgbe m chọtara Izrel, ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara; mgbe m hụrụ nna nna unu ha, ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig. Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa, ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere, si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
12 A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
13 Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
14 Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị.
15 “Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
16 Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
Read Hosea 9 in the app The whole chapter