The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Hosea 13
Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
Hosea 13:12 · Baịbụlụ Nsọ
The iniquity of Ephraim is bound up; his sin is hid.
The iniquity of Ephraim is bound up; his sin is stored up.
The guilt of Ephraim is stored up. His sin is stored up.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 “Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?
10 Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?
11 Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.
12 Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
13 Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.
14 “Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,
15 ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere.
Read Hosea 13 in the app The whole chapter