The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Hosea 13
Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.
Hosea 13:1 · Baịbụlụ Nsọ
When Ephraim spake trembling, he exalted himself in Israel; but when he offended in Baal, he died.
When Ephraim spoke, there was trembling; he was exalted in Israel. But he incurred guilt through Baal, and he died.
When Ephraim spoke, there was trembling. He exalted himself in Israel, but when he became guilty through Baal, he died.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.
2 Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”
3 Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
4 “Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
Read Hosea 13 in the app The whole chapter