The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Hebrews 8

Hebrews 8:2

Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.

Hebrews 8:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Hebrews 8Next →

Hebrews 8:2 in other translations

KJV King James Version

A minister of the sanctuary, and of the true tabernacle, which the Lord pitched, and not man.

BSB Berean Standard Bible

and who ministers in the sanctuary and true tabernacle set up by the Lord, not by man.

WEB World English Bible

a servant of the sanctuary and of the true tabernacle which the Lord pitched, not man.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.

2 Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.

3 A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja.

4 A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị.

5 Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.”

Read Hebrews 8 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV