The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Hebrews 13

Hebrews 13:23

Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.

Hebrews 13:23 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Hebrews 13Next →

Hebrews 13:23 in other translations

KJV King James Version

Know ye that our brother Timothy is set at liberty; with whom, if he come shortly, I will see you.

BSB Berean Standard Bible

Be aware that our brother Timothy has been released. If he arrives soon, I will come with him to see you.

WEB World English Bible

Know that our brother Timothy has been freed, with whom, if he comes shortly, I will see you.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

20 Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ,

21 mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

22 Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.

23 Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.

24 Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.

25 Ka amara dịnyere unu niile.

Read Hebrews 13 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV