The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Hebrews 10

Hebrews 10:21

ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,

Hebrews 10:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Hebrews 10Next →

Hebrews 10:21 in other translations

KJV King James Version

And having an high priest over the house of God;

BSB Berean Standard Bible

and since we have a great priest over the house of God,

WEB World English Bible

and having a great priest over God’s house,

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.

19 Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,

20 bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya,

21 ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,

22 ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.

23 Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.

24 Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.

Read Hebrews 10 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV