The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 7
Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
Genesis 7:8 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 7Next →
Of clean beasts, and of beasts that are not clean, and of fowls, and of every thing that creepeth upon the earth,
The clean and unclean animals, the birds, and everything that crawls along the ground
Clean animals, unclean animals, birds, and everything that creeps on the ground
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
6 Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
7 Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
8 Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
9 oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
10 Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
11 Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
Read Genesis 7 in the app The whole chapter