The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 6
Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.
Genesis 6:14 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 6Next →
Make thee an ark of gopher wood; rooms shalt thou make in the ark, and shalt pitch it within and without with pitch.
Make for yourself an ark of gopher wood; make rooms in the ark and coat it with pitch inside and out.
Make a ship of gopher wood. You shall make rooms in the ship, and shall seal it inside and outside with pitch.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
11 Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
12 Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.
13 Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.
14 Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.
15 Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.
16 Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.
17 Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.
Read Genesis 6 in the app The whole chapter