The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 48
O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.
Genesis 48:17 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 48Next →
And when Joseph saw that his father laid his right hand upon the head of Ephraim, it displeased him: and he held up his father's hand, to remove it from Ephraim's head unto Manasseh's head.
When Joseph saw that his father had placed his right hand on Ephraim’s head, he was displeased and took his father’s hand to move it from Ephraim’s head to Manasseh’s.
When Joseph saw that his father laid his right hand on the head of Ephraim, it displeased him. He held up his father’s hand, to remove it from Ephraim’s head to Manasseh’s head.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
14 Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara.
15 Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya. “Ka Chineke, onye nna m ha Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ ogologo ndụ m niile ruo taa,
16 Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile, ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a. Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m na aha nna m ha Ebraham na Aịzik, ka ha mụbaa hie nne nʼelu ụwa.”
17 O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.
18 Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.”
19 Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.”
20 Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị, “Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a, ‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ” Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase.
Read Genesis 48 in the app The whole chapter