The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 48
Josef sitere nʼikpere Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a.
Genesis 48:12 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 48Next →
And Joseph brought them out from between his knees, and he bowed himself with his face to the earth.
Then Joseph removed his sons from his father’s knees and bowed facedown.
Joseph brought them out from between his knees, and he bowed himself with his face to the earth.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.” Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.”
10 Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha.
11 Izrel sịrị Josef, “O nweghị mgbe m lere anya na m ga-ahụ ihu gị ọzọ. Ma Chineke emeela ka m hụkwa ụmụ gị.”
12 Josef sitere nʼikpere Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a.
13 Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso.
14 Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara.
15 Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya. “Ka Chineke, onye nna m ha Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ ogologo ndụ m niile ruo taa,
Read Genesis 48 in the app The whole chapter