The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 44
Odibo ahụ zara sị ha, “Ka ọ dịrị dịka unu kwuru. Onye ọbụla a chọtara ya nʼaka ga-abụ ohu m. Ma ndị a na-achọtaghị ya nʼaka ha enweghị ịta ụta ọbụla.”
Genesis 44:10 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 44Next →
And he said, Now also let it be according unto your words: he with whom it is found shall be my servant; and ye shall be blameless.
“As you say,” replied the steward. “But only the one who is found with the cup will be my slave, and the rest of you shall be free of blame.”
He said, “Now also let it be according to your words. He with whom it is found will be my slave; and you will be blameless.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
7 Ma ha zara sị ya, “Nna anyị ukwu, gịnị mere i ji ekwu ụdị okwu ndị a? Ihe arụ ka ọ bụ anyị ime ihe dị otu a.
8 Lee, ego anyị chọtara nʼọnụ akpa anyị ka anyị sitere nʼala Kenan weghachi. Olee otu anyị ga-esi zuru ọlaedo maọbụ ọlaọcha site nʼụlọ nna gị ukwu?
9 Onye ọbụla nʼime anyị a chọtara iko a nʼaka ya ga-anwụ. Anyị onwe anyị ga-aghọrọ nna anyị ukwu ndị ohu.”
10 Odibo ahụ zara sị ha, “Ka ọ dịrị dịka unu kwuru. Onye ọbụla a chọtara ya nʼaka ga-abụ ohu m. Ma ndị a na-achọtaghị ya nʼaka ha enweghị ịta ụta ọbụla.”
11 Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya.
12 Odibo ahụ malitere nʼonye ukwu nʼetiti ha chọọ rute nʼonye nta. Ọ bụ nʼakpa Benjamin ka a chọtara iko ahụ.
13 Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta.
Read Genesis 44 in the app The whole chapter