The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 43

Genesis 43:21

Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a.

Genesis 43:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 43Next →

Genesis 43:21 in other translations

KJV King James Version

And it came to pass, when we came to the inn, that we opened our sacks, and, behold, every man's money was in the mouth of his sack, our money in full weight: and we have brought it again in our hand.

BSB Berean Standard Bible

But when we came to the place we lodged for the night, we opened our sacks and, behold, each of us found his silver in the mouth of his sack! It was the full amount of our silver, and we have brought it back with us.

WEB World English Bible

When we came to the lodging place, we opened our sacks, and behold, each man’s money was in the mouth of his sack, our money in full weight. We have brought it back in our hand.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”

19 Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ.

20 Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri.

21 Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a.

22 Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.”

23 Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn.

24 Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri.

Read Genesis 43 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV