The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 43

Genesis 43:16

Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”

Genesis 43:16 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 43Next →

Genesis 43:16 in other translations

KJV King James Version

And when Joseph saw Benjamin with them, he said to the ruler of his house, Bring these men home, and slay, and make ready; for these men shall dine with me at noon.

BSB Berean Standard Bible

When Joseph saw Benjamin with his brothers, he said to the steward of his house, “Take these men to my house. Slaughter an animal and prepare it, for they shall dine with me at noon.”

WEB World English Bible

When Joseph saw Benjamin with them, he said to the steward of his house, “Bring the men into the house, and butcher an animal, and prepare; for the men will dine with me at noon.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

13 Ngwa, kpọrọnụ nwanne unu nwoke bilienụ laghachikwurunụ nwoke ahụ.

14 Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, mee ka nwoke ahụ nwee obi ebere nʼebe unu nọ. Ya meekwa ka o nwee ike ịhapụrụ unu nwanne unu Simiọn na Benjamin ka ha soro unu lọta. Ọ bụrụkwanụ uche Chineke na m ga-agbara aka ụmụ, ya mee dịka o si chọọ.”

15 Ya mere, ndị ikom ahụ weere onyinye ndị a, na okpukpu ego abụọ nʼaka, ma kpọrọkwa Benjamin. Ha biliri ije. Garuo Ijipt, ma guzo nʼihu Josef.

16 Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”

17 Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef.

18 Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”

19 Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ.

Read Genesis 43 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV